ACHŲMNTA AKŲNAŲBA NA NJIKỌKA N’OGE UGBU A: NSOGBU NA OLILEANYA YA NYE NDỊ NTOROBỊA.

Gladys Ifeome Udechukwu (PhD), Vivian Onyinye Okoyeuzu

Abstract


Achųmnta akųnaųba bų otu ihe gbara mkpọrọgwų na ndų ndį Igbo ọ kachasį n’okpuru ọ       chįchį Njikọka na Steeti Anambara nke dį n’akųkų ọwųwa anyanwų  Naįjirįa. Ndį Igbo nọ  na mpaghara Njikọka bų ndį Chineke kesiri ike ma were akpųkpọ  aka na ọgųgų isi chọọ ha mma . Ha kwenyere n’agbambo n’uzo pųrų iche n’ihi na mmadu ekwesįghį įnọ nkįtį , ya mere e ji ekwu sį “Ngana kpuchie ite, agųų ekpughee ya”Ọzọkwa , “Ọnye rųọ  n’anwų , o rie na  ndo”. Mgbe gboo,   ọkpųrųkpų ųzọ   ndį pųtara ihe ndį mpaghara Njikọka si achų nta akųnaųba bų site n’ọrų ugbo,įkpų ųzų  įkpa ihe ọkpųkpa na ųmų ọrų aka ndį ọzọ . O nwekwara ọtųtų ųzọ  ndį ọzọ        ha si akpata akų , dį ka, įkų azu, įkpų  ųzų , įkpa enunu, igbu akwų, įwa eze, ibi ugwu, ikwe akwa nakwa ọrųnka ndį ọzọgasį. Usoro achųmnta  akųnauba ndį Igbo bi n’okpuru ọchįchį Njikọka  n’oge gboo bų ųzọ  doro ọhaneze anya, nke na-eweta ogologo ndų na ahųike  ma na-enyekwa mmadų obi ruru ala  nakwa  afọ ojuju. Ikpata akų na nghọta ha abųghį tigbuo, zọgbuo.N’oge ugbu a achųmnta akų adįghįzį ka e chere. įchųnta ego na-ewetazi ọtųtų ihe mgbu na ihe ọjọọ dį iche iche. Achųmnta akų na-ewetazį ọnọdų ihere, nkolopu obi na ọnwų ike n’ezinųųlọ nakwa n’obodo dį iche iche dįgasį na mpaghara Njikọka. Ndį mmadų, ọkachasį ndį ntorobįa na mpaghara Njikọka ejighįzį ezi akọnauche na ezi obi Chineke nyere ha wee na-achų ego. Nke a mere na ọtųtų na-adaba na nsogbu dį iche iche . Nchọcha a  bų ohere nwanchọcha ji were gosipųta ųzọ dį iche iche ndį Igbo tųmadį  ndį  ntorobįa Njikọka  sizi achų nta akų n’oge ugbu a  na nsogbu dį iche iche si na ya apųta. Nwanchọcha gbara mbọ  tulekọ rįta usoro achųmnta akų n’oge gboo nakwa n’oge ugbu a na Njikọka. Nwanchọcha gbara mbọ na nchọcha a site n’itųnye aro ya gbasara  usoro ziri ezi e si achų nta akų . A chọpųtara na n’ezie ųzọ  ndį Igbo ọkachasį ndį ntorobįa Njikọka na-agbaso n’achųmnta akųnaųba  n’oge a dįwaga iche na nke gboo; a chọputara        na e nwere ọtųtų ihe kpatara ųzọ ndį a e sizi achų nta akų n’oge a , ma chọpųtakwa na e nwere ọtųtų nsogbu si n’ųzọ achųmnta akų ndį a apųta. Ihe a chọpųtara na nchọcha a ga-enye nnukwu aka įgbaziri ndį Igbo niile tųmadį ndį na-etolite etolite ųzọ ziri ezi įgbaso n’įchų nta akų iji belata oke nsogbu dį iche iche na-adapųta n’įkpa akų n’ųzọ ezighį ezi.


Full Text:

PDF

References


gų-Ọfọdile (2004) Asųsų Igbo n’ųzọ dį mfe, Oyo State :Austin Modern Press

Basden George(1982) , Among the Igbos of Nigeria,Onitsha :University Publishing Company.

Betram I.N. Osuagwu (1982) Ndi Igbo na Omenaala ha ; Lagos; Macmillan Nigeria Publishers Limited,

Ekwealor C.C. (2010) : Omenaala na Ewumewu Igbo. Onitsha : Africana First Publishers.

Ezemudo R.M. (1989) Ọmųmų asųsų Igbo . Onitsha: Kawuriz and Manilas publishers

Epom ,U (2012). Wealth and Valuable Posessions . Lagos : Matag Printing

Eze , A (2012) .Corruptive Practices in Nigeria .Enugu : Format Publishers

Ezemọka A. na Anọzie C.C.(2016) Ọnọdų Ugo, Enugu : Computer Edge Publish

F.C. Ogbalu (1979), Omenaala Igbo, Onitsha : Varsity Industrial Press,

Isichei , E. (1976), A History of the Igbo people ,London: Macmillan Press , 9.

Igwe (1989). Ọmųmų asųsų Igbo, Onitsha: Kawuriz and Manilas

Isichei. E. (1977). Igbo Worlds , London : Macmillan Publishers limited

Iwuagwu Obi (2008), Topics in Igbo economic system. Lagos : University Press

Uzochukwu na Ewelukwa (2008) , Nhazi asųsų Igbo: A.C. Global publishing company Onitsha.


Refbacks

  • There are currently no refbacks.


Copyright (c) 2022 Gladys Ifeome Udechukwu (PhD), Vivian Onyinye Okoyeuzu

 

 

ISSN: 3027-0510 (Online)

 

   

 

Creative Commons License
This work is licensed under a Creative Commons Attribution-NonCommercial 4.0 International License.